2 Samuel 18:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị agha Devid tigbukwara ndị agha Izrel. Ha gburu iri puku ndị agha abụọ nʼụbọchị ahụ.
2 Samuel 18:7 in English
2 Samuel 18:7 · Berean Standard Bible
There the people of Israel were defeated by David’s servants, and the slaughter was great that day—twenty thousand men.
Context
5Eze nyere ndịisi agha ya, bụ Joab, Abishai na Itai, iwu sị ha, “Bikonu, nʼihi m, werenụ nwayọọ nʼebe nwokorobịa ahụ bụ Absalọm nọ.” Ndị agha niile nụkwara mgbe eze nyere ndịisi niile iwu a banyere Absalọm. 6Ndị agha Devid si nʼobodo pụọ izute ndị Izrel nʼagha. Alụrụ agha a nʼọhịa Ifrem. 7Ndị agha Devid tigbukwara ndị agha Izrel. Ha gburu iri puku ndị agha abụọ nʼụbọchị ahụ. 8Agha ahụ gbasara nʼelu ala ahụ niile. Ndị nwụrụ nʼọhịa nʼetiti ụmụ Izrel karịrị ndị e gburu egbu. 9Absalọm zutere ndị agha Devid. Ọ na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ya nʼoge a, dịka ịnyịnya ahụ sitere nʼokpuru osisi ook ukwu dị nʼọhịa ahụ na-agbafee, agịrị isi ya konyere nʼalaka osisi ahụ, tụhịkọtaakwa, nke mere na ọ kwụrụ nʼetiti eluigwe na ala. Ma ịnyịnya ya gbaara na-aga.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.