2 Samuel 18:31
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, onye Kush ahụ bịarutere sị, “Onyenwe m bụ eze, nụrụ oziọma a. Taa Onyenwe anyị ekpepụtala gị site nʼịnapụta gị nʼaka ndị niile biliri imegide gị.”
2 Samuel 18:31 in English
2 Samuel 18:31 · Berean Standard Bible
Just then the Cushite came and said, “May my lord the king hear the good news: Today the LORD has avenged you of all who rose up against you!”
Context
29Eze jụrụ ya sị, “Oleekwanụ maka nwokorobịa ahụ bụ Absalọm? Ọ nọkwa nʼudo?”
Ahimaaz zara sị, “Mgbe Joab zipụrụ ohu eze, na mụ onwe m, oke ụzụ dị, ma amaghị m ihe kpatara ya.” 30Eze gwara ya sị, “Chere nʼebe a.” Ahimaaz chigharịrị chere. 31Mgbe ahụ, onye Kush ahụ bịarutere sị, “Onyenwe m bụ eze, nụrụ oziọma a. Taa Onyenwe anyị ekpepụtala gị site nʼịnapụta gị nʼaka ndị niile biliri imegide gị.” 32Eze jụrụ onye Kush ahụ, “Nwokorobịa ahụ bụ Absalọm, ọ nọkwa nʼudo?”
Onye Kush ahụ zaghachiri, “Ka ndị iro onyenwe m bụ eze na ndị niile na-ebili imejọ gị dị ka nwokorobịa ahụ!” 33Okwu a metụrụ eze nʼahụ nke ukwuu, o biliri rigoo nʼụlọ nke dị nʼọnụ ụzọ ama, nọdụ nʼebe ahụ kwaa akwa. Ọ nọ na-akwa akwa mgbe ọ na-aga, na-eti mkpu akwa na-asị, “O, nwa m, Absalọm! O nwa m, nwa m, Absalọm. A sịkwarị na m nwụrụ nʼọnọdụ gị! O, Absalọm nwa m, nwa m oo!”
18:19 2Sa 15:36; 17:17
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.