2 Samuel 18:21
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Joab gwara otu nwoke onye Kush sị ya, “Gaa gwa eze ihe ị hụrụ.” Nwoke ahụ kpọrọ isiala, gbapụ ọsọ.
2 Samuel 18:21 in English
2 Samuel 18:21 · Berean Standard Bible
So Joab said to a Cushite, “Go, tell the king what you have seen.” The Cushite bowed to Joab and took off running.
Context
19Mgbe ahụ, Ahimaaz, nwa Zadọk,* bịakwutere Joab sị ya, “Biko, ka m gbara ọsọ gaa zie eze oziọma a, na Onyenwe anyị azọpụtala ya site nʼaka ndị iro ya.” 20Ma Joab zara sị ya, “Ọ bụghị gị ga-ezi eze ozi taa. I nwere ike ime ya mgbe ọzọ, ma ọ bụghị taa, nʼihi na nwa eze nwụrụ.” 21Joab gwara otu nwoke onye Kush sị ya, “Gaa gwa eze ihe ị hụrụ.” Nwoke ahụ kpọrọ isiala, gbapụ ọsọ. 22Ahimaaz nwa Zadọk rịọkwara Joab ọzọ sị ya, “Otu ọbụla o si dị, biko kwere ka m gbaso onye Kush a.”
Ma Joab zara sị, “Nwa m nwoke, gịnị mere i ji chọọ ị ga? I nweghị ozi ọbụla ị ga-ezi nke ga-ewetara gị ụgwọ ọrụ.” 23Ọ rịọrọ sị, “Otu ọbụla o si dị, hapụ m ka m gaa.”
Nʼikpeazụ Joab kwenyere sị ya, “Ọ dị mma, gbara ọsọ gaa.” Ahimaaz sitere nʼụzọ dị mkpụmkpụ nke gafere obosara ala Jọdan buru nwoke Kush ahụ ụzọ gbaruo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.