Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nwanne ya nwoke, Absalọm jụrụ ya sị, “Amnọn, nwanne gị nwoke, o dinakwuuru gị? Ma ugbu a, nwanne m, gba nkịtị, nwanne gị nwoke ka ọ bụ. Etinyela ihe a mere nʼobi.” Tama nọrọ dịka onye mmadụ niile jụrụ ajụ nʼụlọ nwanne ya nwoke, bụ Absalọm.

2 Samuel 13:20 in English

2 Samuel 13:20 · Berean Standard Bible

Her brother Absalom said to her, “Has your brother Amnon been with you? Be quiet for now, my sister. He is your brother. Do not take this thing to heart.” So Tamar lived as a desolate woman in the house of her brother Absalom.

Context

18Onyeozi ya chụpụrụ ya nʼezi, kpachie ụzọ nʼazụ ya. Uwe mwụda nwere aka ogologo ka Tama yi, nʼihi na ọ bụ ụdị nke ụmụ ndị inyom eze na-amaghị nwoke na-eyi. 19Tama dọwara uwe* mwụda ahụ o yi nʼahụ, werekwa ntụ kpokwasị onwe ya nʼisi, buru aka ya nʼisi na-eti mkpu akwa dịka ọ na-ala. 20Nwanne ya nwoke, Absalọm jụrụ ya sị, “Amnọn, nwanne gị nwoke, o dinakwuuru gị? Ma ugbu a, nwanne m, gba nkịtị, nwanne gị nwoke ka ọ bụ. Etinyela ihe a mere nʼobi.” Tama nọrọ dịka onye mmadụ niile jụrụ ajụ nʼụlọ nwanne ya nwoke, bụ Absalọm. 21Mgbe eze Devid nụrụ ihe ndị a niile, iwe were ya nke ukwuu. 22Absalọm agwaghị Amnọn okwu ọbụla, maọbụ nke dị mma, maọbụ okwu ọjọọ. Ma ọ kpọrọ Amnọn asị nke ukwuu nʼihi ọnọdụ iweda nʼala o wedara nwanne ya Tama, mee ya ihe ihere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.