2 Samuel 13:18
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyeozi ya chụpụrụ ya nʼezi, kpachie ụzọ nʼazụ ya. Uwe mwụda nwere aka ogologo ka Tama yi, nʼihi na ọ bụ ụdị nke ụmụ ndị inyom eze na-amaghị nwoke na-eyi.
2 Samuel 13:18 in English
2 Samuel 13:18 · Berean Standard Bible
So Amnon’s attendant threw her out and bolted the door behind her. Now Tamar was wearing a robe of many colors,* because this is what the king’s virgin daughters wore.
Context
16Ma Tama kwara akwa sị ya, “Mba! Ịjụ m otu a ka njọ karịa ihe ọjọọ i mere m.”
Ma Amnọn egeghị ya ntị. 17Ọ kpọrọ nwokorobịa na-ejere ya ozi sị ya, “Chụpụ nwanyị a nʼezi, kpachiere m ụzọ nʼazụ.” 18Onyeozi ya chụpụrụ ya nʼezi, kpachie ụzọ nʼazụ ya. Uwe mwụda nwere aka ogologo ka Tama yi, nʼihi na ọ bụ ụdị nke ụmụ ndị inyom eze na-amaghị nwoke na-eyi. 19Tama dọwara uwe* mwụda ahụ o yi nʼahụ, werekwa ntụ kpokwasị onwe ya nʼisi, buru aka ya nʼisi na-eti mkpu akwa dịka ọ na-ala. 20Nwanne ya nwoke, Absalọm jụrụ ya sị, “Amnọn, nwanne gị nwoke, o dinakwuuru gị? Ma ugbu a, nwanne m, gba nkịtị, nwanne gị nwoke ka ọ bụ. Etinyela ihe a mere nʼobi.” Tama nọrọ dịka onye mmadụ niile jụrụ ajụ nʼụlọ nwanne ya nwoke, bụ Absalọm.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.