Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Absalọm nwa Devid nwere otu nwanne nwanyị mara mma, aha ya bụ Tama.* Ma Amnọn, otu nʼime ụmụ ndị ikom Devid, hụrụ nwaagbọghọ a nʼanya.

2 Samuel 13:1 in English

2 Samuel 13:1 · Berean Standard Bible

After some time, David’s son Amnon fell in love with Tamar, the beautiful sister of David’s son Absalom.

Context

1Absalọm nwa Devid nwere otu nwanne nwanyị mara mma, aha ya bụ Tama.* Ma Amnọn, otu nʼime ụmụ ndị ikom Devid, hụrụ nwaagbọghọ a nʼanya. 2Ma ịhụnanya a Amnọn hụrụ Tama nwanne ya nwanyị mere ya ka ọ daa ọrịa, nʼihi na ọ bụ ihe rara Amnọn ahụ ịchọpụta ụzọ ya na Tama ga-esi nwee mmekọ, ebe ọ bụ na Tama bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke.* 3Ma Amnọn nwere otu enyi dị aghụghọ, onye aha ya bụ Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.