Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ kpọpụtara ndị nọ nʼebe ahụ, manye ha nʼịrụ ọrụ nke e ji mma nkwọ e ji awa osisi, na igwe e ji egwu ala na anyụike nʼarụ. O mere ka ha rụọ ọrụ nʼebe a na-akpụ blọk brik. Devid mekwara otu ihe a nʼobodo niile nke ụmụ Amọn. Emesịa, ya na ndị agha ya niile laghachiri na Jerusalem.

2 Samuel 12:31 in English

2 Samuel 12:31 · Berean Standard Bible

David brought out the people who were there and put them to work with saws,* iron picks, and axes, and he made them work at the brick kilns.* He did the same to all the Ammonite cities. Then David and all his troops returned to Jerusalem.

Context

29Nʼihi nke a, Devid duuru ndị agha Izrel jeruo Raba, buso ya agha, meriekwa ya. 30Devid kpupuru okpueze nke dị nʼisi eze ha, e kpunye ya nʼisi nke ya onwe ya. Ịdị arọ nke okpueze ahụ ruru kilogram ọlaedo iri atọ na anọ, nke e ji nkume ndị dị oke ọnụahịa chọọ mma. Devid sitekwara nʼobodo ahụ kwakọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha. 31Ọ kpọpụtara ndị nọ nʼebe ahụ, manye ha nʼịrụ ọrụ nke e ji mma nkwọ e ji awa osisi, na igwe e ji egwu ala na anyụike nʼarụ. O mere ka ha rụọ ọrụ nʼebe a na-akpụ blọk brik. Devid mekwara otu ihe a nʼobodo niile nke ụmụ Amọn. Emesịa, ya na ndị agha ya niile laghachiri na Jerusalem.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.