Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid kpupuru okpueze nke dị nʼisi eze ha, e kpunye ya nʼisi nke ya onwe ya. Ịdị arọ nke okpueze ahụ ruru kilogram ọlaedo iri atọ na anọ, nke e ji nkume ndị dị oke ọnụahịa chọọ mma. Devid sitekwara nʼobodo ahụ kwakọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha.

2 Samuel 12:30 in English

2 Samuel 12:30 · Berean Standard Bible

Then he took the crown from the head of their king.* It weighed a talent of gold * and was set with precious stones, and it was placed on David’s head. And David took a great amount of plunder from the city.

Context

28Ugbu a chịkọtaa ndị agha fọdụrụ bịa lụpụchaa agha a, ka ị dọta obodo a nʼagha. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m adọta obodo a nʼagha, a ga-akpọkwasịkwa ya aha m.” 29Nʼihi nke a, Devid duuru ndị agha Izrel jeruo Raba, buso ya agha, meriekwa ya. 30Devid kpupuru okpueze nke dị nʼisi eze ha, e kpunye ya nʼisi nke ya onwe ya. Ịdị arọ nke okpueze ahụ ruru kilogram ọlaedo iri atọ na anọ, nke e ji nkume ndị dị oke ọnụahịa chọọ mma. Devid sitekwara nʼobodo ahụ kwakọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha. 31Ọ kpọpụtara ndị nọ nʼebe ahụ, manye ha nʼịrụ ọrụ nke e ji mma nkwọ e ji awa osisi, na igwe e ji egwu ala na anyụike nʼarụ. O mere ka ha rụọ ọrụ nʼebe a na-akpụ blọk brik. Devid mekwara otu ihe a nʼobodo niile nke ụmụ Amọn. Emesịa, ya na ndị agha ya niile laghachiri na Jerusalem.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.