Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, nʼihi ihe a i mere, mma agha agaghị esi nʼezinaụlọ gị pụọ, nʼihi na i ledara m anya kpọrọ nwunye Ụraya onye Het ka ọ bụrụ nwunye gị.’

2 Samuel 12:10 in English

2 Samuel 12:10 · Berean Standard Bible

Now, therefore, the sword will never depart from your house, because you have despised Me and have taken the wife of Uriah the Hittite to be your own.’

Context

8Enyere m gị ụlọ nna gị ukwu, nyefekwa ndị inyom nna gị ukwu nʼaka gị, na alaeze Izrel na Juda, ka ha bụrụ nke gị. Ma ọ bụrụ na nke a ezughị, agaara m atụkwasịrị gị ihe ndị a niile okpukpu okpukpu. 9Gịnị mere i ji lelịa okwu Onyenwe anyị anya, mee ihe a jọgburu onwe ya? Nʼihi na i jirila mma agha gbuo Ụraya onye Het, zurukwa nwunye ya nʼohi. Ọ bụkwa mma agha ndị Amọn ka i ji gbuo ya. 10Ya mere, nʼihi ihe a i mere, mma agha agaghị esi nʼezinaụlọ gị pụọ, nʼihi na i ledara m anya kpọrọ nwunye Ụraya onye Het ka ọ bụrụ nwunye gị.’ 11“Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ si nʼezinaụlọ gị bilie megide gị. Nʼihu gị ka m ga-eduru ndị nwunye gị dunye otu onye dị gị nnọọ nso, ya na ha ga-edinakọ nʼehihie ọcha, nʼihu ndị Izrel niile. 12I mere mmehie gị na nzuzo, ma aga m eme nke a na mbara, nʼihu Izrel niile.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.