2 Samuel 11:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Ụraya bịakwutere ya, Devid jụrụ ya otu Joab mere, na otu ndị agha Izrel dị na otu agha si aga.
2 Samuel 11:7 in English
2 Samuel 11:7 · Berean Standard Bible
When Uriah came to him, David asked how Joab and the troops were doing with the war.
Context
5Nwanyị a mechara dị ime, bịa ziga ozi ka agwa Devid. Ọ sịrị, “Adị m ime.” 6Mgbe Devid nụrụ ya, o zigaara Joab ozi sị ya, “Zitere m Ụraya, onye Het.” 7Mgbe Ụraya bịakwutere ya, Devid jụrụ ya otu Joab mere, na otu ndị agha Izrel dị na otu agha si aga. 8Devid sịrị Ụraya, “Laa nʼụlọ gị gaa saa ụkwụ gị.” Ụraya si nʼụlọeze pụọ. E zipụkwara onyinye nke ndị na-ejere eze ozi ji sochie ya azụ. 9Ma Ụraya agaghị nʼụlọ ya. Kama o so ndị na-ejere eze ozi dinaa nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.