Native Bible

2 Kings 9:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jehu jekwuuru ndịisi agha ibe ya. Otu onye nʼime ha jụrụ ya sị, “Gịnị ka onye ara ahụ chọrọ bịa? Udo ọ dịkwa?” Jehu zara, “Unu maara onye ọ bụ, marakwa ụdị okwu ga-esi ya nʼọnụ pụta.”

2 Kings 9:11 in English

2 Kings 9:11 · Berean Standard Bible

When Jehu went out to the servants of his master, they asked, “Is everything all right? Why did this madman come to you?” “You know his kind and their babble,” he replied.

Context

9M ga-ala ụlọ Ehab nʼiyi, ka m si laa ezinaụlọ Jeroboam nwa Nebat nʼiyi, na dịka m si lakwaa ezinaụlọ Baasha, nwa Ahija nʼiyi. 10Nkịta ga-erikwa anụ Jezebel nwunye Ehab na Jezril. Ọ dịkwaghị onye ga-eli ya.’ ” Mgbe o kwuchara okwu ndị a, onye amụma ahụ meghere ụzọ gbapụ ọsọ. 11Jehu jekwuuru ndịisi agha ibe ya. Otu onye nʼime ha jụrụ ya sị, “Gịnị ka onye ara ahụ chọrọ bịa? Udo ọ dịkwa?” Jehu zara, “Unu maara onye ọ bụ, marakwa ụdị okwu ga-esi ya nʼọnụ pụta.” 12Ha sịrị, “Ihe i kwuru abụghị eziokwu, gwa anyị ihe o kwuru.” Jehu sịrị, “Ihe ndị a ka ọ gwara m, ‘Otu a ka a Onyenwe anyị kwuru, Eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’ ” 13Ngwangwa ha chịịrị uwe mgbokwasị ha niile doo ha nʼusoro nʼala ebe ahụ ka Jehu zọkwasị ha ụkwụ. Ha fụrụ opi ike tie mkpu sị, “Jehu bụ eze!”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.