Native Bible

2 Kings 9:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nkịta ga-erikwa anụ Jezebel nwunye Ehab na Jezril. Ọ dịkwaghị onye ga-eli ya.’ ” Mgbe o kwuchara okwu ndị a, onye amụma ahụ meghere ụzọ gbapụ ọsọ.

2 Kings 9:10 in English

2 Kings 9:10 · Berean Standard Bible

And on the plot of ground at Jezreel the dogs will devour Jezebel, and there will be no one to bury her.’” Then the young prophet opened the door and ran.

Context

8Ezinaụlọ Ehab ga-abụ ihe lara nʼiyi. Nʼala Izrel, m ga-esite nʼezinaụlọ Ehab bipụ ndị ikom niile, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya. 9M ga-ala ụlọ Ehab nʼiyi, ka m si laa ezinaụlọ Jeroboam nwa Nebat nʼiyi, na dịka m si lakwaa ezinaụlọ Baasha, nwa Ahija nʼiyi. 10Nkịta ga-erikwa anụ Jezebel nwunye Ehab na Jezril. Ọ dịkwaghị onye ga-eli ya.’ ” Mgbe o kwuchara okwu ndị a, onye amụma ahụ meghere ụzọ gbapụ ọsọ. 11Jehu jekwuuru ndịisi agha ibe ya. Otu onye nʼime ha jụrụ ya sị, “Gịnị ka onye ara ahụ chọrọ bịa? Udo ọ dịkwa?” Jehu zara, “Unu maara onye ọ bụ, marakwa ụdị okwu ga-esi ya nʼọnụ pụta.” 12Ha sịrị, “Ihe i kwuru abụghị eziokwu, gwa anyị ihe o kwuru.” Jehu sịrị, “Ihe ndị a ka ọ gwara m, ‘Otu a ka a Onyenwe anyị kwuru, Eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.