Native Bible

2 Kings 8:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Akụkọ ihe niile Jehoram mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Juda mere nʼụbọchị ndụ ha?

2 Kings 8:23 in English

2 Kings 8:23 · Berean Standard Bible

As for the rest of the acts of Jehoram, along with all his accomplishments, are they not written in the book of the Chronicles of the Kings of Judah?

Context

21Ya mere, Jehoram* duuru ụgbọ agha ya niile gaa nʼobodo Zaịa. O biliri nʼabalị tigbuo ndị Edọm ahụ gbara ya na ndị ọchịagha ụgbọ agha ya gburugburu; ma ndị agha ya gbaghachiri azụ, laa nʼụlọ ha. 22Ya mere, Edọm ka na-enupu isi megide Juda, ruo taa. Obodo Libna nupukwara isi nʼotu oge ahụ. 23Akụkọ ihe niile Jehoram mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Juda mere nʼụbọchị ndụ ha? 24Joram sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri nna ya ha nʼobodo Devid. Ahazaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 25Nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị Joram nwa Ehab, bụ eze Izrel, ka Ahazaya nwa Jehoram, bụ eze Juda malitere ịchị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.