2 Ndị Eze 8:1
2 Kings 8:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịlaisha gwara nwanyị ahụ o mere ka nwa ya si nʼọnwụ bilie okwu sị ya, “Bilie, gị na ezinaụlọ gị, gaa nʼobodo ọzọ ebe unu ga-anọ dịka ọbịa nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola na oke ụnwụ ga-adakwasị ala Izrel afọ asaa.”
2 Kings 8:1 in English
2 Kings 8:1 · Berean Standard Bible
Now Elisha had said to the woman whose son he had restored to life, “Arise, you and your household; go and live as a foreigner wherever you can. For the LORD has decreed a seven-year famine, and it has already come to the land.”
Context
1Ịlaisha gwara nwanyị ahụ o mere ka nwa ya si nʼọnwụ bilie okwu sị ya, “Bilie, gị na ezinaụlọ gị, gaa nʼobodo ọzọ ebe unu ga-anọ dịka ọbịa nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola na oke ụnwụ ga-adakwasị ala Izrel afọ asaa.” 2Nwanyị ahụ mere dịka onye nke Chineke gwara ya, o biliri, ya na ezinaụlọ ya gaa biri nʼala ndị Filistia* afọ asaa. 3Mgbe ụnwụ ahụ gwụsịrị nʼafọ nke asaa, o si nʼala ndị Filistia lọta nʼIzrel. Mgbe ọ lọtara, o jekwuuru eze ka o nyere ya aka inwetaghachi ụlọ ya na ala ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.