Native Bible

2 Kings 5:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ịlaisha zara sị ya, “Ọ dị mma, laa nʼudo.” Mgbe Neeman lawara, o jerubeghị ebe dị anya,

2 Kings 5:19 in English

2 Kings 5:19 · Berean Standard Bible

“Go in peace,” said Elisha. But after Naaman had traveled a short distance,

Context

17Mgbe ahụ Neeman sịrị, “Ọ bụrụ na ị gaghị anara, biko, kwerenụ ka m kporo aja nke ịnyịnya abụọ nwere ike ibu. Nʼihi na site ugbu a gaa nʼihu, agaghị m achụrụ chi ọzọ aja nsure ọkụ, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị. 18Ma ka Onyenwe anyị gbaghara ohu gị naanị otu ihe a. Mgbe nna m ukwu banyere nʼụlọ arụsị Rimọn ịkpọ isiala, mgbe ọ na-adabere nʼaka m, nke ga-eme ka mụ onwe m kpọọkwa isiala. Mgbe m si otu a kpọọ isiala nʼụlọ arụsị Rimọn, ka Onyenwe anyị gbaghara ohu gị nʼihi nke a.” 19Ịlaisha zara sị ya, “Ọ dị mma, laa nʼudo.” Mgbe Neeman lawara, o jerubeghị ebe dị anya, 20Gehazi, bụ onyeozi Ịlaisha onye nke Chineke, sịrị nʼobi ya, “Nna m ukwu emezighị ikwere ka Neeman onye Aram laa na-anataghị ya ihe o ji bịa. Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m eji ọsọ gbakwuru ya napụta ya ụfọdụ ihe ahụ.” 21Ya mere, Gehazi gbara ọsọ gbakwuru Neeman. Mgbe Neeman hụrụ ya ka ọ gba ọsọ na-abịa, o si nʼelu ụgbọ agha ya wudata gaa zute ya, jụọ ya sị: “Udo ọ dịkwa?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.