Native Bible

2 Kings 4:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Gehazi butere ụzọ rute nʼụlọ ahụ, were mkpanaka ahụ tụkwasị nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ, ma nke a emeghị ka nwantakịrị ahụ teta ma ọ bụkwanụ kuo ume. Ya mere, Gehazi laghachiri izute Ịlaisha, gwa ya sị, “Nwata ahụ etetaghị.”

2 Kings 4:31 in English

2 Kings 4:31 · Berean Standard Bible

Gehazi went on ahead of them and laid the staff on the boy’s face, but there was no sound or response. So he went back to meet Elisha and told him, “The boy has not awakened.”

Context

29Ịlaisha sịrị Gehazi, “Ngwa, were ihe ike nʼukwu jikọta uwe mwụda gị, werekwa mkpanaka m nʼaka gị, bilie gaa Shunem. Mgbe ị na-aga ekelekwala onye ọbụla ekele. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla ekelee gị, azala ekele ya. Gaa nʼụlọ ahụ. I ruo, tụkwasị mkpanaka m nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ.” 30Ma nne nwantakịrị ahụ zara sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị laa.” Ịlaisha biliri soro ya bido ịla nʼụlọ ya. 31Ma Gehazi butere ụzọ rute nʼụlọ ahụ, were mkpanaka ahụ tụkwasị nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ, ma nke a emeghị ka nwantakịrị ahụ teta ma ọ bụkwanụ kuo ume. Ya mere, Gehazi laghachiri izute Ịlaisha, gwa ya sị, “Nwata ahụ etetaghị.” 32Mgbe Ịlaisha rutere nʼụlọ ahụ, ọ hụrụ ka nwantakịrị ahụ nwụrụ anwụ dina nʼelu ihe ndina ya. 33Ọ banyere nʼime ọnụụlọ ahụ, mechibido ha abụọ ụzọ, kpee ekpere, kpọkuo Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.