Native Bible

2 Kings 4:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ịlaisha sịrị Gehazi, “Ngwa, were ihe ike nʼukwu jikọta uwe mwụda gị, werekwa mkpanaka m nʼaka gị, bilie gaa Shunem. Mgbe ị na-aga ekelekwala onye ọbụla ekele. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla ekelee gị, azala ekele ya. Gaa nʼụlọ ahụ. I ruo, tụkwasị mkpanaka m nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ.”

2 Kings 4:29 in English

2 Kings 4:29 · Berean Standard Bible

So Elisha said to Gehazi, “Tie up your garment,* take my staff in your hand, and go! If you meet anyone, do not greet him, and if anyone greets you, do not answer him. Then lay my staff on the boy’s face.”

Context

27Ma mgbe ọ bịakwutere onye nke Chineke, ọ dara nʼala nʼihu ya, jide ya nʼụkwụ ya abụọ. Gehazi bịaruru nso inupu ya, ma onyeozi Chineke sịrị ya, “Hapụ ya aka, nʼihi na ọ dị ihe na-enye ya nsogbu nʼime mmụọ ya, ma Onyenwe anyị zonarịrị m ya, ọ gwaghịkwa m ihe mere.” 28Nwanyị ahụ sịrị, “Onyenwe m, arịọrọ m gị nye m nwa nwoke? Ọ bụ na m asịghị gị, ‘emeela m ka m nwee olileanya’?” 29Ịlaisha sịrị Gehazi, “Ngwa, were ihe ike nʼukwu jikọta uwe mwụda gị, werekwa mkpanaka m nʼaka gị, bilie gaa Shunem. Mgbe ị na-aga ekelekwala onye ọbụla ekele. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla ekelee gị, azala ekele ya. Gaa nʼụlọ ahụ. I ruo, tụkwasị mkpanaka m nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ.” 30Ma nne nwantakịrị ahụ zara sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị laa.” Ịlaisha biliri soro ya bido ịla nʼụlọ ya. 31Ma Gehazi butere ụzọ rute nʼụlọ ahụ, were mkpanaka ahụ tụkwasị nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ, ma nke a emeghị ka nwantakịrị ahụ teta ma ọ bụkwanụ kuo ume. Ya mere, Gehazi laghachiri izute Ịlaisha, gwa ya sị, “Nwata ahụ etetaghị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.