2 Ndị Eze 4:3
2 Kings 4:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịlaisha sịrị, “Jegharịa na-ezi, gaa nata ndị agbataobi gị niile ite nke ihe ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha abụkwala ole na ole.
2 Kings 4:3 in English
2 Kings 4:3 · Berean Standard Bible
“Go,” said Elisha, “borrow jars, even empty ones, from all your neighbors. Do not gather just a few.
Context
1Otu ụbọchị, otu nwanyị nʼime ndị inyom ndị amụma bịakwutere Ịlaisha rịọ ya sị, “Ohu gị, bụ di m anwụọla. Ị matara na ọ na-atụ egwu* Onyenwe anyị. Ma ugbu a, onye o ji ụgwọ na-abịa ịkpọrọ ụmụ m ndị ikom abụọ ime ka ha bụrụ ndị ohu ya.” 2Ịlaisha jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị ka m ga-emere gị? Gwa m, gịnị ka i nwere nʼụlọ?”
Nwanyị ahụ zara sị, “O nweghị ihe ọbụla ohu gị nwanyị nwere nʼụlọ karịa naanị ntakịrị mmanụ.”* 3Ịlaisha sịrị, “Jegharịa na-ezi, gaa nata ndị agbataobi gị niile ite nke ihe ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha abụkwala ole na ole. 4Mgbe ahụ, baa nʼime ụlọ, gị na ụmụ gị, mechibido onwe unu ụzọ. Malite ịgbanye mmanụ ahụ nʼime ite ahụ niile, mgbe nke ọbụla juru, bupụ ya nʼotu akụkụ.” 5Nwanyị ahụ hapụrụ ya, ga mechibido onwe ya na ụmụ ya ndị ikom ụzọ. Ha na-ebutere ya ite niile ahụ nso, ebe ya onwe ya na-agbanye agbanye nʼime ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.