Native Bible

2 Kings 4:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu ụbọchị, otu nwanyị nʼime ndị inyom ndị amụma bịakwutere Ịlaisha rịọ ya sị, “Ohu gị, bụ di m anwụọla. Ị matara na ọ na-atụ egwu* Onyenwe anyị. Ma ugbu a, onye o ji ụgwọ na-abịa ịkpọrọ ụmụ m ndị ikom abụọ ime ka ha bụrụ ndị ohu ya.”

2 Kings 4:1 in English

2 Kings 4:1 · Berean Standard Bible

Now the wife of one of the sons of the prophets cried out to Elisha, “Your servant, my husband, is dead, and you know that your servant feared the LORD. And now his creditor is coming to take my two children as his slaves!”

Context

1Otu ụbọchị, otu nwanyị nʼime ndị inyom ndị amụma bịakwutere Ịlaisha rịọ ya sị, “Ohu gị, bụ di m anwụọla. Ị matara na ọ na-atụ egwu* Onyenwe anyị. Ma ugbu a, onye o ji ụgwọ na-abịa ịkpọrọ ụmụ m ndị ikom abụọ ime ka ha bụrụ ndị ohu ya.” 2Ịlaisha jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị ka m ga-emere gị? Gwa m, gịnị ka i nwere nʼụlọ?” Nwanyị ahụ zara sị, “O nweghị ihe ọbụla ohu gị nwanyị nwere nʼụlọ karịa naanị ntakịrị mmanụ.”* 3Ịlaisha sịrị, “Jegharịa na-ezi, gaa nata ndị agbataobi gị niile ite nke ihe ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha abụkwala ole na ole.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.