2 Ndị Eze 4:14
2 Kings 4:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịlaisha jụrụ, “Gịnịkwa ka anyị ga-emere nwanyị a?” Gehazi sịrị, “Nʼezie, o nweghị nwa nwoke, di ya emeekwala agadi.”
2 Kings 4:14 in English
2 Kings 4:14 · Berean Standard Bible
So he asked, “Then what should be done for her?” “Well, she has no son,” Gehazi replied, “and her husband is old.”
Context
12Ọ sịrị Gehazi onye na-ejere ya ozi, “Gaa kpọọ onye Shunem a,” Ya mere, ọ kpọrọ ya, ọ bịara guzo nʼihu ya, 13Ịlaisha gwara Gehazi, “Gwa nwanyị ahụ, sị, ‘Lee, otu i si enye onwe gị nsogbu niile ndị a maka anyị. Ugbu a, gịnị ka a ga-emere gị? Ọ bụ ka anyị gwa eze okwu banyere gị, ka ọ bụ ịgwa onyeisi ndị agha?’ ”
Ọ zara, “Ebi m nʼetiti ndị m.” 14Ịlaisha jụrụ, “Gịnịkwa ka anyị ga-emere nwanyị a?”
Gehazi sịrị, “Nʼezie, o nweghị nwa nwoke, di ya emeekwala agadi.” 15Ịlaisha sịrị, “Kpọọ ya.” Ya mere, Gehazi kpọrọ ya, ọ bịara guzo nʼọnụ ụzọ. 16Ịlaisha sịrị, “Na mgbe dị otu a nʼafọ ọzọ, ị ga-eku nwa nwoke nʼaka gị abụọ.”
Ọ sịrị, “Mba, onyenwe m, biko, gị onye nke Chineke, agwala ohu gị nwanyị okwu ụgha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.