Native Bible

2 Kings 3:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nke a bụ ihe dị nta nʼebe Onyenwe anyị nọ, nʼihi na ọ ga-enyefekwa ndị Moab nʼaka unu.

2 Kings 3:18 in English

2 Kings 3:18 · Berean Standard Bible

This is a simple matter in the sight of the LORD, and He will also deliver the Moabites into your hand.

Context

16Ọ sịrị, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, aga m eme ka ndagwurugwu a jupụta nʼolulu mmiri. 17Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu agaghị ahụ ifufe maọbụ mmiri ozuzo, ma ndagwurugwu a ga-ejupụta na mmiri, unu onwe unu ga-aṅụ, na ehi unu, na anụmanụ ndị ọzọ unu ga-aṅụkwa mmiri. 18Ma nke a bụ ihe dị nta nʼebe Onyenwe anyị nọ, nʼihi na ọ ga-enyefekwa ndị Moab nʼaka unu. 19Unu ga-etigbu obodo ọbụla e wusiri ike, na obodo ukwu niile. Unu ga-egbudakwa ezi osisi ha na-amị mkpụrụ, kpọchie isi mmiri ha niile, werekwa nkume mebikwaa ezi ala ubi ha niile.” 20O ruo, nʼụtụtụ, nʼoge e ji achụ aja nsure ọkụ ụtụtụ, lee na mmiri sitere ụzọ Edọm sọọrọ bịa nʼebe ahụ ha gwuru olulu na ndagwurugwu ala ahụ sọjuo ala ahụ niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.