Native Bible

2 Kings 25:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

e jide ya. Ha kpụgara ya eze Babilọn, nʼobodo Ribla, ebe a nọ maa ya ikpe.

2 Kings 25:6 in English

2 Kings 25:6 · Berean Standard Bible

The Chaldeans seized the king and brought him up to the king of Babylon at Riblah, where they pronounced judgment on him.

Context

4Mgbe ahụ, e tipuru oghere nʼaja mgbidi obodo ahụ, ndị agha niile ji abalị gbapụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, nʼagbanyeghị na ndị Kaldịa* nọ obodo ahụ gburugburu. Ha gbapụrụ chee ihu nʼụzọ Araba.* 5Ma ndị agha Kaldịa chụsoro eze nʼazụ, chụkwute ya na mbara ala Jeriko. Ndị agha ya niile sitere nʼebe ọ nọ gbasasịa, hapụ ya, 6e jide ya. Ha kpụgara ya eze Babilọn, nʼobodo Ribla, ebe a nọ maa ya ikpe. 7Ha gburu ụmụ ndị ikom Zedekaya nʼihu ya. Ha ghụpụrụ anya ya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, kpọrọ ya gaa Babilọn. 8Nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke ise nke afọ iri na itoolu nke ọchịchị eze Nebukadneza na Babilọn, Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche, onyeisi nʼọrụ eze Babilọn, bịarutere Jerusalem.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.