2 Ndị Eze 25:4
2 Kings 25:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, e tipuru oghere nʼaja mgbidi obodo ahụ, ndị agha niile ji abalị gbapụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, nʼagbanyeghị na ndị Kaldịa* nọ obodo ahụ gburugburu. Ha gbapụrụ chee ihu nʼụzọ Araba.*
2 Kings 25:4 in English
2 Kings 25:4 · Berean Standard Bible
Then the city was breached; and though the Chaldeans * had surrounded the city, all the men of war fled by night by way of the gate between the two walls near the king’s garden. They headed toward the Arabah,*
Context
2Anọchibidoro obodo a nʼagha ruo nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị eze Zedekaya. 3Nʼụbọchị nke itoolu nke ọnwa anọ nʼafọ ahụ, oke ụnwụ siri ike dị nʼobodo ahụ ruo na ọ dịkwaghị nri dị nke ndị mmadụ ga-eri. 4Mgbe ahụ, e tipuru oghere nʼaja mgbidi obodo ahụ, ndị agha niile ji abalị gbapụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, nʼagbanyeghị na ndị Kaldịa* nọ obodo ahụ gburugburu. Ha gbapụrụ chee ihu nʼụzọ Araba.* 5Ma ndị agha Kaldịa chụsoro eze nʼazụ, chụkwute ya na mbara ala Jeriko. Ndị agha ya niile sitere nʼebe ọ nọ gbasasịa, hapụ ya, 6e jide ya.
Ha kpụgara ya eze Babilọn, nʼobodo Ribla, ebe a nọ maa ya ikpe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.