Native Bible

2 Kings 23:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ dịghị eze ọzọ nʼime ndị niile buru ya ụzọ chịa nke dịka Josaya, onye chigharịkwutere Onyenwe anyị. Onye ji obi ya niile, na mmụọ ya niile na ike ya niile debe iwu niile e nyere Mosis.* Ọ dịkwaghị eze ọzọ dịka ya, onye biliri mgbe ọ nwụsịrị.

2 Kings 23:25 in English

2 Kings 23:25 · Berean Standard Bible

Neither before nor after Josiah was there any king like him, who turned to the LORD with all his heart and with all his soul and with all his strength, according to all the Law of Moses.

Context

23Ma ọ bụ nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị eze Josaya, nʼime Jerusalem ka a nọ mee Mmemme Ngabiga a nye Onyenwe anyị. 24Ọzọkwa, Josaya gara nʼihu kpochapụ ndị niile na-ajụta mmụọ ọjọọ ase, na ndị dibịa afa, na arụsị* ezinaụlọ dị iche iche, na arụsị a pịrị apị, na ihe arụ niile nke a hụrụ nʼime Juda na Jerusalem niile. O mere nke a ka e mezuo ihe niile e dere nʼime akwụkwọ ahụ Hilkaya onye nchụaja chọtara nʼụlọ Onyenwe anyị. 25Ọ dịghị eze ọzọ nʼime ndị niile buru ya ụzọ chịa nke dịka Josaya, onye chigharịkwutere Onyenwe anyị. Onye ji obi ya niile, na mmụọ ya niile na ike ya niile debe iwu niile e nyere Mosis.* Ọ dịkwaghị eze ọzọ dịka ya, onye biliri mgbe ọ nwụsịrị. 26Ma ihe ndị a emeghị ka iwe ọkụ Onyenwe anyị na-ewe megide Juda dajụọ, bụ iwe a kpasuru ya nʼihi ihe ọjọọ niile nke Manase mere. 27Ya mere, Onyenwe anyị sịrị, “Aga m ekpochapụ Juda niile site nʼihu m, dịka m si kpochapụ Izrel niile. Aga m ajụkwa obodo ahụ m họpụtara, bụ Jerusalem, jụkwa ụlọnsọ ukwu a nke m kwuru banyere ya sị, ‘Nʼime ya ka Aha m ga-adị.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.