Native Bible

2 Kings 23:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Josaya kwadara ebe ịchụ aja niile nke ndị eze Juda wukwasịrị nʼelu ụlọeze, nʼelu elu ụlọ Ehaz. Ọ kwadakwara ebe ịchụ aja niile nke Manase wuru nʼime ogige abụọ nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, kporo ha kpofuo nʼime Ndagwurugwu Kidrọn.

2 Kings 23:12 in English

2 Kings 23:12 · Berean Standard Bible

He pulled down the altars that the kings of Judah had set up on the roof near the upper chamber of Ahaz, and the altars that Manasseh had set up in the two courtyards of the house of the LORD. The king pulverized them there * and threw their dust into the Kidron Valley.

Context

10Josaya merụrụ Tofet, laa ya nʼiyi. Tofet bụ ebe ịchụ aja dị na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. O mere nke a igbochi mmadụ ọbụla iji nwa ya nwoke, maọbụ nwa ya nwanyị chụọrọ chi Molek aja nsure ọkụ. 11O sitere nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị wepụ ịnyịnya ndị ahụ ndị eze Juda doro nsọ nye anyanwụ. Ịnyịnya ndị a dị nʼogige ụlọnsọ Onyenwe anyị nʼebe dị nso nʼụlọ onyeozi aha ya bụ Netan-Melek. Josaya kpọrọ ụgbọ agha ndị a niile e doro nsọ nye anyanwụ ọkụ. 12Josaya kwadara ebe ịchụ aja niile nke ndị eze Juda wukwasịrị nʼelu ụlọeze, nʼelu elu ụlọ Ehaz. Ọ kwadakwara ebe ịchụ aja niile nke Manase wuru nʼime ogige abụọ nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, kporo ha kpofuo nʼime Ndagwurugwu Kidrọn. 13Eze merụkwara ebe ịchụ aja niile dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo Jerusalem nʼakụkụ ndịda nke Ugwu Mbibi, nke Solomọn eze Izrel wuru nye chi Ashtọret, ihe arụ ndị Saịdọn, na chi Kemosh, ihe arụ ndị Moab, na chi Molek, ihe arụ ụmụ Amọn. 14Josaya kwadakwara ogidi nkume niile, gbutuo ihe arụsị Ashera niile, werekwa ọkpụkpụ ndị mmadụ wụsa nʼelu ala ahụ niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.