Native Bible

2 Kings 23:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Josaya merụrụ Tofet, laa ya nʼiyi. Tofet bụ ebe ịchụ aja dị na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. O mere nke a igbochi mmadụ ọbụla iji nwa ya nwoke, maọbụ nwa ya nwanyị chụọrọ chi Molek aja nsure ọkụ.

2 Kings 23:10 in English

2 Kings 23:10 · Berean Standard Bible

He also desecrated Topheth in the Valley of Ben-hinnom * so that no one could sacrifice his son or daughter in the fire * to Molech.

Context

8O mere ka ndị nchụaja niile site nʼobodo Juda niile bịa, o merụkwara ebe ịchụ aja niile nke dị elu, site na Geba ruo Bịasheba, ebe ndị nchụaja ndị a nọrọ suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Ọ kwatụrụ ọnụ ụzọ ama nke dị nʼebe ọnụ ụzọ ama Joshua, onye bụ gọvanọ obodo, nke dị nʼakụkụ aka ekpe nke ọnụ ụzọ ama obodo. 9Ma e kweghị ka ndị nchụaja ahụ jee ozi nʼụlọnsọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem, ma o nyere ha ike iso ndị nchụaja ndị ọzọ rie achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. 10Josaya merụrụ Tofet, laa ya nʼiyi. Tofet bụ ebe ịchụ aja dị na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. O mere nke a igbochi mmadụ ọbụla iji nwa ya nwoke, maọbụ nwa ya nwanyị chụọrọ chi Molek aja nsure ọkụ. 11O sitere nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị wepụ ịnyịnya ndị ahụ ndị eze Juda doro nsọ nye anyanwụ. Ịnyịnya ndị a dị nʼogige ụlọnsọ Onyenwe anyị nʼebe dị nso nʼụlọ onyeozi aha ya bụ Netan-Melek. Josaya kpọrọ ụgbọ agha ndị a niile e doro nsọ nye anyanwụ ọkụ. 12Josaya kwadara ebe ịchụ aja niile nke ndị eze Juda wukwasịrị nʼelu ụlọeze, nʼelu elu ụlọ Ehaz. Ọ kwadakwara ebe ịchụ aja niile nke Manase wuru nʼime ogige abụọ nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, kporo ha kpofuo nʼime Ndagwurugwu Kidrọn.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.