2 Ndị Eze 21:10
2 Kings 21:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ ndị amụma ya, sị,
2 Kings 21:10 in English
2 Kings 21:10 · Berean Standard Bible
And the LORD spoke through His servants the prophets, saying,
Context
8Ma agaghị emekwa ka ụkwụ ndị Izrel wagharịa ọzọ site nʼala ahụ nke m nyere ndị nna nna ha, naanị ma ọ bụrụ na ha elezie anya debe ihe niile m nyere ha nʼiwu ma debekwa iwu niile nke ohu m bụ Mosis nyere ha.” 9Ma ha egeghị ntị, Manase duhiere ha, mee ka ha mee ihe dị njọ karịa nke ndị mba niile ndị Onyenwe anyị lara nʼiyi site nʼihu ndị Izrel. 10Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ ndị amụma ya, sị, 11“Nʼihi na Manase, eze Juda emeela ihe arụ ndị a, o meela ihe dị njọ karịa nke ndị Amọrait,* bụ ndị bụ ya ụzọ, o werela arụsị ya duba Juda nʼime mmehie. 12Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, sịrị: Lee, ana m aga iweta mbibi dị ukwuu nke ga-adakwasị Jerusalem na Juda, nke ntị ọbụla nụrụ ya ga-azụ wuruwuru.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.