Native Bible

2 Kings 19:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼoge ahụ, Senakerib natara ozi na Tiahaka, eze Kush,* na-apụta ịbịa ibuso ya agha. Ya mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha ga zie Hezekaya ozi, sị,

2 Kings 19:9 in English

2 Kings 19:9 · Berean Standard Bible

Now Sennacherib had been warned about Tirhakah king of Cush:* “Look, he has set out to fight against you.” So Sennacherib again sent messengers to Hezekiah, saying,

Context

7Gee ntị, mgbe ọ nụrụ akụkọ dị aṅaa, aga m eme ka ọ chọọ ịlaghachi nʼobodo nke aka ya. Nʼebe ahụ ka m ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ya.’ ” 8Mgbe ọchịagha ahụ nụrụ na eze Asịrịa e sitela nʼobodo Lakish pụa, ọ laghachiri hụ na eze Asịrịa na-ebuso obodo Libna agha. 9Nʼoge ahụ, Senakerib natara ozi na Tiahaka, eze Kush,* na-apụta ịbịa ibuso ya agha. Ya mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha ga zie Hezekaya ozi, sị, 10“Gwanụ Hezekaya, eze Juda, Ekwela ka Chineke onye ị na-atụkwasị obi duhie gị, mgbe ọ na-asị, ‘Agaghị enyefe Jerusalem nʼaka eze Asịrịa.’ 11Nʼezie a, ị nụla ihe ndị eze Asịrịa mere obodo niile ha busoro agha, otu ha si bibie ha kpamkpam. Ma a ga-anapụtakwa gị onwe gị?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.