Native Bible

2 Kings 18:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ndị ahụ niile gbara nkịtị, ha ekwughị ihe ọbụla, nʼihi na eze nyere ha iwu sị, “Unu azaghachila ya.”

2 Kings 18:36 in English

2 Kings 18:36 · Berean Standard Bible

But the people remained silent and did not answer a word, for Hezekiah had commanded, “Do not answer him.”

Context

34Olee ebe ka chi ndị Hamat na Apad nọ? Olee ebe ka chi ndị Sefavaim, Hena na Iva nọkwa? Ha anapụtala Sameria site nʼaka m? 35Olee chi nʼime chi mba ndị a niile bụ nke zọpụtarala ala ya site nʼaka m? Unu si aṅaa chee na Onyenwe anyị pụrụ ịzọpụta Jerusalem site nʼaka m?” 36Ma ndị ahụ niile gbara nkịtị, ha ekwughị ihe ọbụla, nʼihi na eze nyere ha iwu sị, “Unu azaghachila ya.” 37Mgbe ahụ, Eliakịm nwa Hilkaya, onye na-elekọta ụlọeze, na Shebna ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf ode akwụkwọ, ha yi uwe ha dọwara adọwa, bịakwute Hezekaya gwa ya ihe niile onyeisi agha ahụ kwuru. 18:2 Maọbụ, Abi 18:17 A na-akpọ Tatan 18:17 Olulu warawara mmiri nke eze Hezekaya gwuru, bụ maka i ji webata mmiri nʼime obodo site nʼiyi Gaihọn. 18:20 Ọ bụ sọsọ okwu egbugbere ọnụ 18:26 Asụsụ Aramaik (ndị Siria) bụ asụsụ mba na mba ji emekọrịta ihe nʼoge ahụ, ma ọ mesịrị ghọọ asụsụ ndị Juu, site na senchuri nke ise tupu a mụọ Kraịst. 18:31 Na mgbe ochie a na-eme udo site nʼịgba ndụ 18:31 Nke a na-egosi ọnọdụ udo na ọganihu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.