2 Ndị Eze 17:7
2 Kings 17:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a niile mere nʼihi na ndị Izrel mehiere megide Onyenwe anyị, bụ Chineke ha, onye ahụ mere ka ha site nʼokpuru ike Fero, eze Ijipt pụta. Ha kpọrọ isiala nye* chi ndị ọzọ
2 Kings 17:7 in English
2 Kings 17:7 · Berean Standard Bible
All this happened because the people of Israel had sinned against the LORD their God, who had brought them out of the land of Egypt from under the hand of Pharaoh king of Egypt. They had worshiped other gods
Context
5Eze Asịrịa wakporo ala ahụ niile nʼagha, gbagoo imegide Sameria, nọchibido ya gburugburu, afọ atọ. 6Nʼafọ itoolu nke ọchịchị Hoshea, eze Asịrịa dọtara Sameria nʼagha,* dọkpụrụ ndị Izrel niile buga ha nʼala Asịrịa. O mere ka ha biri nʼobodo Hala, nʼime Gozan nke dị nʼosimiri Hoboa, na nʼime obodo ndị Midia. 7Ihe ndị a niile mere nʼihi na ndị Izrel mehiere megide Onyenwe anyị, bụ Chineke ha, onye ahụ mere ka ha site nʼokpuru ike Fero, eze Ijipt pụta. Ha kpọrọ isiala nye* chi ndị ọzọ 8gbasoro omenaala niile nke ndị mba ahụ Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼala ha. Ha gbasokwara omenaala ọjọọ ndị ahụ niile ndị eze ha webatara. 9Ndị Izrel mere ihe ndị ahụ niile Onyenwe anyị Chineke ha na-adịghị anabata na nzuzo. Ha wuru ebe ịchụ aja nye chi dị iche iche nʼobodo ha niile, e, nʼobodo ukwu ma nʼobodo nta ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.