Native Bible

2 Kings 17:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Eze Asịrịa wakporo ala ahụ niile nʼagha, gbagoo imegide Sameria, nọchibido ya gburugburu, afọ atọ.

2 Kings 17:5 in English

2 Kings 17:5 · Berean Standard Bible

Then the king of Assyria invaded the whole land, marched up to Samaria, and besieged it for three years.

Context

3Shalmanesa eze Asịrịa bịara buso Hoshea agha, nʼihi na Hoshea nọ nʼokpuru ọchịchị eze Asịrịa, bụrụkwa onye na-atụ ụtụ nye ya kwa afọ. 4Ma eze Asịrịa chọpụtara na Hoshea abụghị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihi na Hoshea eze Izrel zipụrụ ndị ozi ya ka ha jekwuru So, eze Ijipt, maka enyemaka. Ọzọkwa, Hoshea kwụsịrị ịtụ ụtụ nye eze Asịrịa dịka ọ na-eme kwa afọ. Nʼihi ya Shalmanesa nwụchiri ya, tinye ya nʼụlọ mkpọrọ. 5Eze Asịrịa wakporo ala ahụ niile nʼagha, gbagoo imegide Sameria, nọchibido ya gburugburu, afọ atọ. 6Nʼafọ itoolu nke ọchịchị Hoshea, eze Asịrịa dọtara Sameria nʼagha,* dọkpụrụ ndị Izrel niile buga ha nʼala Asịrịa. O mere ka ha biri nʼobodo Hala, nʼime Gozan nke dị nʼosimiri Hoboa, na nʼime obodo ndị Midia. 7Ihe ndị a niile mere nʼihi na ndị Izrel mehiere megide Onyenwe anyị, bụ Chineke ha, onye ahụ mere ka ha site nʼokpuru ike Fero, eze Ijipt pụta. Ha kpọrọ isiala nye* chi ndị ọzọ

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.