Native Bible

2 Kings 17:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Kama, tụọnụ egwu ma fee Onyenwe anyị Chineke unu. Ọ bụ ya ga-anapụta unu site nʼaka ndị iro unu niile.”

2 Kings 17:39 in English

2 Kings 17:39 · Berean Standard Bible

but worship the LORD your God, and He will deliver you from the hands of all your enemies.”

Context

37Unu ga-elezi anya hụ na unu debere ụkpụrụ na iwu niile, ntụziaka na ihe niile enyere nʼiwu ndị a e depụtara nʼakwụkwọ nye unu. Unu atụkwala egwu* chi ndị ọzọ. 38Unu echefula ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara. Unu akpọkwala isiala nye chi ndị ọzọ nʼihi egwu. 39Kama, tụọnụ egwu ma fee Onyenwe anyị Chineke unu. Ọ bụ ya ga-anapụta unu site nʼaka ndị iro unu niile.” 40Ma ndị Izrel egeghị ntị, kama, dịka ụzọ ọjọọ ha si dị, ha fere chi ọzọ ofufe. 41Ọ bụ ezie na ndị a na-efe Onyenwe anyị ofufe, ma ha nọgidekwara na-ejere arụsị niile ha ozi. Ruo taa, ụmụ ha, na ụmụ ụmụ ha, gara nʼihu na-emekwa ihe nna nna ha mere. 17:6 Ndọta a dọtara ndị Izrel nʼagha nʼoge a, bụ nke ugboro abụọ. Nke mbụ, bụ nʼoge Peka bụ eze. 2Ez 15:29 17:7 Fere chi ndị ọzọ ofufe 17:18 Ndị alaeze ndịda si nʼagbụrụ Simiọn na Benjamin, maọbụ naanị ebo Juda gosiri onwe ha ndị kwesiri ntụkwasị obi, gụọ akwụkwọ 1Ez 11:13,32 17:25 Nʼihi nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu nwa oge nta, nke mere ka ọdụm bi nʼọhịa ndị Palestia mụbaa. Lev 26:21-22 17:27 Onye nʼotu nʼime ndị nchụaja ahụ Jeroboam họpụtara, bụ ndị na-achụ aja nye chi nwa ehi ahụ ọ kpụrụ na Betel. 1Ez 12:31 17:32 Kpọkwara isiala nye 17:37 Maọbụ, efekwala

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.