Native Bible

2 Kings 17:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị si Ava mekwara Nibaz, na Tatak, ma ndị si Sefavaim na-esure ụmụ ha nʼọkụ dịka aja nye Adramelek na Anamelek, bụ chi ndị Sefavaim.

2 Kings 17:31 in English

2 Kings 17:31 · Berean Standard Bible

the Avvites made Nibhaz and Tartak, and the Sepharvites burned their children in the fire to Adrammelech and Anammelech the gods of the Sepharvaim.

Context

29Nʼagbanyeghị nke a, ndị mba ọbụla meere onwe ha chi nke aka ha nʼobodo ahụ niile ebe ha bi nʼime ya. Ha guzobere chi ndị a nʼụlọ arụsị nke ndị Sameria wuru nʼebe niile dị elu. 30Ndị si Babilọn mere chi ha a na-akpọ Sukọt Benot; ndị si Kut emee Neagal, ebe ndị si Hamat mekwara Ashima. 31Ndị si Ava mekwara Nibaz, na Tatak, ma ndị si Sefavaim na-esure ụmụ ha nʼọkụ dịka aja nye Adramelek na Anamelek, bụ chi ndị Sefavaim. 32Ha tụrụ egwu* Onyenwe anyị, ma ha họpụtara ụdị mmadụ dị iche iche site nʼetiti onwe ha, ndị na-ejere ha ozi dịka ndị nchụaja nʼụlọ chi ha dị nʼebe niile dị elu. 33Ha na-atụ egwu Onyenwe anyị ma ha gara nʼihu na-efe chi nke aka ha dịka omenaala mba ebe ndị e si dọta ha nʼagha si dị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.