2 Ndị Eze 17:27
2 Kings 17:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eze Asịrịa nyere iwu sị: “Ka otu onye nʼime ndị nchụaja* e si na Sameria dọta nʼagha laghachi gaa biri nʼebe ahụ, izi ndị bi nʼobodo ahụ ihe chi ala ahụ chọrọ.”
2 Kings 17:27 in English
2 Kings 17:27 · Berean Standard Bible
Then the king of Assyria commanded: “Send back one of the priests you carried off from Samaria, and have him go back to live there and teach the requirements of the God of the land.”
Context
25Ma mgbe ndị Asịrịa malitere ibi nʼebe ahụ, ha atụghị egwu Onyenwe anyị, maọbụ fee ya ofufe. Nʼihi ya, Onyenwe anyị zitere ọdụm* ndị batara nʼetiti ha gbuo ụfọdụ mmadụ nʼime ha. 26Ya mere, e zigara eze Asịrịa ozi sị ya, “Ndị ahụ i dọtara nʼagha mee ka ha bịa biri nʼobodo Sameria amaghị ihe chi nwe ala ahụ chọrọ. O zitere ọdụm nʼetiti ha, nke na-egbu ha, nʼihi na ndị ahụ amaghị ihe ọ chọrọ.” 27Eze Asịrịa nyere iwu sị: “Ka otu onye nʼime ndị nchụaja* e si na Sameria dọta nʼagha laghachi gaa biri nʼebe ahụ, izi ndị bi nʼobodo ahụ ihe chi ala ahụ chọrọ.” 28Ya mere, otu nʼime ndị nchụaja ebuuru site na Sameria gaa ala ọzọ, bịara biri na Betel, kuziere ha otu ha ga-esi na-atụ egwu Onyenwe anyị. 29Nʼagbanyeghị nke a, ndị mba ọbụla meere onwe ha chi nke aka ha nʼobodo ahụ niile ebe ha bi nʼime ya. Ha guzobere chi ndị a nʼụlọ arụsị nke ndị Sameria wuru nʼebe niile dị elu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.