2 Ndị Eze 17:26
2 Kings 17:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, e zigara eze Asịrịa ozi sị ya, “Ndị ahụ i dọtara nʼagha mee ka ha bịa biri nʼobodo Sameria amaghị ihe chi nwe ala ahụ chọrọ. O zitere ọdụm nʼetiti ha, nke na-egbu ha, nʼihi na ndị ahụ amaghị ihe ọ chọrọ.”
2 Kings 17:26 in English
2 Kings 17:26 · Berean Standard Bible
So they spoke to the king of Assyria, saying, “The peoples that you have removed and placed in the cities of Samaria do not know the requirements of the God of the land. Because of this, He has sent lions among them, which are indeed killing them off.”
Context
24Eze Asịrịa sitere nʼala Babilọn, Kuta, Ava, Hamat na Sefavaim kpọta ndị mmadụ bịara biri nʼobodo Sameria ịnọchi anya ndị Izrel niile e sitere nʼebe ahụ bupụ. Nʼụzọ dị otu a, ha nwetara Sameria birikwa nʼobodo ya niile. 25Ma mgbe ndị Asịrịa malitere ibi nʼebe ahụ, ha atụghị egwu Onyenwe anyị, maọbụ fee ya ofufe. Nʼihi ya, Onyenwe anyị zitere ọdụm* ndị batara nʼetiti ha gbuo ụfọdụ mmadụ nʼime ha. 26Ya mere, e zigara eze Asịrịa ozi sị ya, “Ndị ahụ i dọtara nʼagha mee ka ha bịa biri nʼobodo Sameria amaghị ihe chi nwe ala ahụ chọrọ. O zitere ọdụm nʼetiti ha, nke na-egbu ha, nʼihi na ndị ahụ amaghị ihe ọ chọrọ.” 27Eze Asịrịa nyere iwu sị: “Ka otu onye nʼime ndị nchụaja* e si na Sameria dọta nʼagha laghachi gaa biri nʼebe ahụ, izi ndị bi nʼobodo ahụ ihe chi ala ahụ chọrọ.” 28Ya mere, otu nʼime ndị nchụaja ebuuru site na Sameria gaa ala ọzọ, bịara biri na Betel, kuziere ha otu ha ga-esi na-atụ egwu Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.