Native Bible

2 Kings 16:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ehaz soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Hezekaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 16:1 Ehaz na nna ya Jotam, chịkọrọ dịka eze na Juda nʼime senchuri nke asatọ (Tupu a mụọ Kraịst). 16:7 Arịrịọ enyemaka a site nʼebe eze Pul nọ, mere ka ndị Izrel tufuo ọnọdụ i nwere onwe ha. 2Ih 28:20; Dit 28:36

2 Kings 16:20 in English

2 Kings 16:20 · Berean Standard Bible

And Ahaz rested with his fathers and was buried with them in the City of David, and his son Hezekiah reigned in his place.

Context

18Nʼihi imekwa ka obi tọọ eze Asịrịa ụtọ, o wepụrụ ụzọ a na-esite maka ụbọchị izuike nke e wuru nʼime ụlọnsọ, na ụzọ mbata eze si abanye nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 19Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ehaz, na ihe ndị o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 20Ehaz soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Hezekaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 16:1 Ehaz na nna ya Jotam, chịkọrọ dịka eze na Juda nʼime senchuri nke asatọ (Tupu a mụọ Kraịst). 16:7 Arịrịọ enyemaka a site nʼebe eze Pul nọ, mere ka ndị Izrel tufuo ọnọdụ i nwere onwe ha. 2Ih 28:20; Dit 28:36

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.