Native Bible

2 Kings 15:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼafọ nke iri atọ na asatọ nke ọchịchị eze Azaraya bụ eze Juda, ka Zekaraya, nwa Jeroboam ghọrọ eze Izrel na Sameria. Ọ chịrị ọnwa isii.

2 Kings 15:8 in English

2 Kings 15:8 · Berean Standard Bible

In the thirty-eighth year of Azariah’s reign over Judah, Zechariah son of Jeroboam became king of Israel, and he reigned in Samaria six months.

Context

6Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Azaraya, na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 7Azaraya soro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nso nʼebe e liri ha, nʼime obodo Devid. Jotam nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 8Nʼafọ nke iri atọ na asatọ nke ọchịchị eze Azaraya bụ eze Juda, ka Zekaraya, nwa Jeroboam ghọrọ eze Izrel na Sameria. Ọ chịrị ọnwa isii. 9Dịka ndị nna ya bu ya ụzọ si mee, Zekaraya mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O mekwara dịka Jeroboam nwa Nebat, onye dubara ndị Izrel na mmehie ịkpọ isiala nye chi ọzọ. 10Shalum nwa Jebesh, na ndị ọzọ, gbara izu ọjọọ megide ya, tigbuo ya nʼihu ndị Izrel niile. Ọ ghọkwara eze mgbe Zekaraya nwụrụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.