2 Ndị Eze 15:36
2 Kings 15:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma banyere ihe ndị ọzọ niile nke oge ọchịchị Jotam na ihe o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
2 Kings 15:36 in English
2 Kings 15:36 · Berean Standard Bible
As for the rest of the acts of Jotham, along with his accomplishments, are they not written in the Book of the Chronicles of the Kings of Judah?
Context
34O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Ụzaya mere. 35Kama, o wezugaghị ebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu, ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja nsure ọkụ dị iche iche na aja na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ. Jotam wugharịrị Ọnụ Ụzọ ama nke dị Elu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 36Ma banyere ihe ndị ọzọ niile nke oge ọchịchị Jotam na ihe o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 37(Nʼụbọchị ndị ahụ, Onyenwe anyị malitere izite Rezin eze ndị Aram na Peka nwa Remalaya, imegide ndị Juda.) 38Jotam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha, nʼobodo Devid, bụ obodo nna ya. Ehaz nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
15:1 Ọ bụ nʼime senchuri nke asatọ (Tupu a mụọ Kraịst)
15:5 A kọrọ akụkọ a nʼakwụkwọ 2Ih 26:16-21 ebe ọ pụtara ìhè. Chineke mere ka eze ghọọ onye ekpenta nʼihi nleda anya o ledara ndị nchụaja, mgbe ọ gara chụọ aja, bụ ihe ọ na-ekwesighị ime dịka eze ọ bụ. Ọnụ 3:10; 16:39-40; 18:6-7
15:5 Ọ bụ Jotam nọ na-achị ala ahụ nʼọnọdụ eze Azaraya ruo mgbe ọ nwụrụ.
15:19 Pul bụkwa onye a na-akpọ Tiglat-Pilesa, nʼasụsụ ndị Babilọn, gụọ 1Ih 5:26
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.