2 Ndị Eze 15:30
2 Kings 15:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge ahụ, Hoshea nwa Elaa gbara izu ọjọọ megide Peka nwa Remalaya gbuo ya, bụrụ eze nʼọnọdụ ya. Ọ malitere ịbụ eze nʼafọ nke iri abụọ nke ọchịchị eze Jotam nwa Uzaya.
2 Kings 15:30 in English
2 Kings 15:30 · Berean Standard Bible
Then Hoshea son of Elah led a conspiracy against Pekah son of Remaliah. In the twentieth year of Jotham son of Uzziah, Hoshea attacked Pekah, killed him, and reigned in his place.
Context
28O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O fere chi ọzọ ofufe, o sighị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ mmehie nke o dubara ndị Izrel nʼime ya. 29Nʼoge Peka bụ eze Izrel, ka Tiglat-Pilesa, eze Asịrịa bịara were Ijon, Ebel-Bet-Maaka, Janoa, Kedesh, Hazọ, Gilead, Galili na ala ndị Naftalị niile. Ọ chụpụrụ ndị mmadụ niile mee ka ha gaa biri nʼAsịrịa. 30Nʼoge ahụ, Hoshea nwa Elaa gbara izu ọjọọ megide Peka nwa Remalaya gbuo ya, bụrụ eze nʼọnọdụ ya. Ọ malitere ịbụ eze nʼafọ nke iri abụọ nke ọchịchị eze Jotam nwa Uzaya. 31Akụkọ banyere Peka na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel niile mere nʼụbọchị ndụ ha? 32Nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị Peka nwa Remalaya eze Izrel ka Jotam nwa Ụzaya eze Juda malitere ọchịchị ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.