Native Bible

2 Kings 15:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Menahem nwa Gadi sitere nʼobodo Tịaza bịaruo Sameria gbuo Shalum nwa Jebesh ghọọ eze nʼọnọdụ ya.

2 Kings 15:14 in English

2 Kings 15:14 · Berean Standard Bible

Then Menahem son of Gadi went up from Tirzah to Samaria, struck down and killed Shallum son of Jabesh, and reigned in his place.

Context

12Ya mere, okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Jehu mezuru, nke bụ: “Ụmụ ụmụ gị ga-anọkwasị nʼocheeze Izrel ruo nʼọgbọ nke anọ ha.” 13Shalum nwa Jebesh malitere ịbụ eze nʼafọ nke iri atọ na itoolu nke ọchịchị Uzaya eze Juda. Ọ chịrị otu ọnwa na Sameria. 14Menahem nwa Gadi sitere nʼobodo Tịaza bịaruo Sameria gbuo Shalum nwa Jebesh ghọọ eze nʼọnọdụ ya. 15Akụkọ ndị ọzọ gbasara Shalum na izu ọjọọ ya, e deghị ha nʼakwụkwọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel na-achị. 16Nʼoge ahụ, Menahem sitere na Tịaza buso obodo Tipsa agha, na onye ọbụla bi nʼobodo ahụ na gburugburu ya nʼihi na ha ekweghị emeghe ọnụ ụzọ ama ha. O tigburu Tifsa kwakọrọ ihe niile, bọwakwaa afọ ndị inyom niile dị ime.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.