2 Ndị Eze 15:12
2 Kings 15:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Jehu mezuru, nke bụ: “Ụmụ ụmụ gị ga-anọkwasị nʼocheeze Izrel ruo nʼọgbọ nke anọ ha.”
2 Kings 15:12 in English
2 Kings 15:12 · Berean Standard Bible
So the word of the LORD spoken to Jehu was fulfilled: “Four generations of your sons will sit on the throne of Israel.”
Context
10Shalum nwa Jebesh, na ndị ọzọ, gbara izu ọjọọ megide ya, tigbuo ya nʼihu ndị Izrel niile. Ọ ghọkwara eze mgbe Zekaraya nwụrụ. 11Akụkọ metụtara ihe ndị ọzọ mere mgbe Zekaraya bụ eze, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha. 12Ya mere, okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Jehu mezuru, nke bụ: “Ụmụ ụmụ gị ga-anọkwasị nʼocheeze Izrel ruo nʼọgbọ nke anọ ha.” 13Shalum nwa Jebesh malitere ịbụ eze nʼafọ nke iri atọ na itoolu nke ọchịchị Uzaya eze Juda. Ọ chịrị otu ọnwa na Sameria. 14Menahem nwa Gadi sitere nʼobodo Tịaza bịaruo Sameria gbuo Shalum nwa Jebesh ghọọ eze nʼọnọdụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.