Native Bible

2 Kings 14:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Akụkọ niile gbasara ihe niile Jeroboam mere, na ike ya niile, na agha niile o buru, na otu o si nwetaghachiri ndị Izrel obodo Damaskọs na Hamat, bụ obodo ndị Juda, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha?

2 Kings 14:28 in English

2 Kings 14:28 · Berean Standard Bible

As for the rest of the acts of Jeroboam, along with all his accomplishments and might, and how he waged war and recovered both Damascus and Hamath for Israel from Judah, are they not written in the Book of the Chronicles of the Kings of Israel?

Context

26Onyenwe anyị hụrụ ọnọdụ ọjọọ nke ndị Izrel nọ nʼime ya; onye ọbụla nʼime ha, ohu na onye nwe onwe ya, nọ nʼoke ahụhụ. Ọ dịkwaghị onye inyeaka ọbụla ha nwere. 27Ma ọ bụghị uche Onyenwe anyị ịla Izrel nʼiyi kpamkpam nʼokpuru eluigwe, nʼihi ya ka o mere ka Jeroboam nwa Jehoash napụta ha site nʼaka ndị iro ha. 28Akụkọ niile gbasara ihe niile Jeroboam mere, na ike ya niile, na agha niile o buru, na otu o si nwetaghachiri ndị Izrel obodo Damaskọs na Hamat, bụ obodo ndị Juda, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha? 29Jeroboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ndị eze Izrel nwụrụ anwụ. Ma Zekaraya nwa ya ghọrọ eze Izrel nʼọnọdụ ya. 14:7 Aha a na-akpọ Sela nʼasụsụ Griik bụ Petra. Petra bụ isi obodo Idumia. 14:7 Jos 15:38 14:13 Neh 8:16; 12:39

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.