2 Ndị Eze 12:6
2 Kings 12:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma nʼafọ nke iri abụọ na atọ nke ọchịchị eze Joash, ọ chọpụtara na ndị nchụaja ahụ emezibeghị ihe mebiri nʼụlọnsọ.
2 Kings 12:6 in English
2 Kings 12:6 · Berean Standard Bible
By the twenty-third year of the reign of Joash, however, the priests had not yet repaired the damage to the temple.
Context
4Joash sịrị ndị nchụaja, “Nakọtaanụ ego niile a na-ewebata dịka onyinye dị nsọ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ya bụ, ego a na-anakọta nʼoge ịgụ mmadụ ọnụ, na ego e webatara maka imezu nkwa ndị mmadụ kwere, na ego e webatara nʼụlọnsọ ukwu dịka onyinye afọ ofufe. 5Ka onye nchụaja ọbụla site nʼaka otu nʼime ndị na-eche ego nara ego, a ga-eji mezie ihe ọbụla a chọpụtara na o mebiri nʼụlọnsọ ukwu ahụ.” 6Ma nʼafọ nke iri abụọ na atọ nke ọchịchị eze Joash, ọ chọpụtara na ndị nchụaja ahụ emezibeghị ihe mebiri nʼụlọnsọ. 7Ya mere, eze Joash* kpọrọ Jehoiada, onye nchụaja, kpọkwaa ndị nchụaja ndị ọzọ jụọ ha, “Gịnị mere unu emezibeghị ụlọnsọ a? Site ugbu a gaa nʼihu, unu esitekwala nʼaka ndị na-eche ego anara ego ọzọ, kama, nyefeenụ ya maka iji dozie ụlọnsọ ukwu ahụ.” 8Ndị nchụaja ahụ kwenyere sị, “Anyị agaghị esitekwa nʼaka ndị mmadụ nara ego ọbụla. Otu a kwa, anyị agaghị emezikwa ụlọnsọ ukwu a nʼonwe anyị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.