2 Ndị Eze 11:19
2 Kings 11:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ kpọọrọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ha na ndị Karị, na ndị nche, ha na ndị ala ahụ niile, ha niile dupụtara eze site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị site nʼọnụ ụzọ ndị nche banye nʼụlọeze. Eze were ọnọdụ ya nʼelu ocheeze.
2 Kings 11:19 in English
2 Kings 11:19 · Berean Standard Bible
He took with him the commanders of hundreds, the Carites, the guards, and all the people of the land, and they brought the king down from the house of the LORD and entered the royal palace by way of the Gate of the Guards. Then Joash took his seat on the royal throne,
Context
17Jehoiada mere ka ọgbụgba ndụ dị nʼetiti Onyenwe anyị na eze, na ndị mmadụ, na ha ga-abụ ndị nke Onyenwe anyị. O mekwara ka ọgbụgba ndụ dịrị nʼetiti eze na ndị ahụ. 18Ndị niile nke ala ahụ gara nʼụlọ nchụaja Baal kwatuo ya. Ha tidasịrị ebe nchụaja na arụsị niile dị nʼebe ahụ mee ka ọ darisịa, gbukwaa Matan onye nchụaja Baal nʼihu ebe ịchụ aja ahụ.
Mgbe ahụ, Jehoiada onye nchụaja, debekwara ndị nche ka ha lekọta ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 19Ọ kpọọrọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ha na ndị Karị, na ndị nche, ha na ndị ala ahụ niile, ha niile dupụtara eze site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị site nʼọnụ ụzọ ndị nche banye nʼụlọeze. Eze were ọnọdụ ya nʼelu ocheeze. 20Ndị ala ahụ niile ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu, obodo ahụ dakwara jụụ, nʼihi na e ji mma agha gbuo Atalaya nʼụlọeze. 21Joash* gbara afọ asaa mgbe ọ malitere ịbụ eze.
11:2 Eleghị anya, nne Jehosheba dị iche na nne Atalaya, ma nʼihi na Jehosheba bụ nwunye Jehoiada onye nchụaja, o zoro Joash nʼotu ọnụụlọ nʼime ụlọnsọ ukwu 2Ih 22:11
11:2 Mgbe ụfọdụ a na-akpọkwa ya Jehoram
11:2 Joash bụ nwa eku nʼaka nke ka na-anụ ara, o rubeghị otu afọ mgbe ihe ndị a mere.
11:4 Ndị Karị bụ ndị agha e goro ego si Eshịa na mpaghara Tọki. Ha bụ ndị nọchiri anya ndị agha Keret, ndị jere ozi nʼoge eze Devid. 2Sa 8:18
11:4 Nʼakwụkwọ 2Ih 23:2 nʼebe ahụ e mere ka anyị mara na akpọrọ ndị Livayị, na ndịisi Juda niile nʼoku nzuzo a.
11:14 2Ez 23:3; 2Ih 34:31
11:21 Maọbụ, Jehoash
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.