2 Ndị Eze 11:16
2 Kings 11:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ha jidere ya, mgbe o rutere nʼụzọ ebe ịnyịnya si abata nʼogige ụlọeze, ebe ahụ ka ha nọ gbuo ya.
2 Kings 11:16 in English
2 Kings 11:16 · Berean Standard Bible
So they seized Athaliah as she reached the horses’ entrance to the palace grounds, and there she was put to death.
Context
14O lepụrụ anya, ma lee eze, ka o guzo nʼakụkụ ogidi,* dịka omenaala mmemme ịchị eze si dị. Ndịisi na ndị na-afụ opi nọ nʼakụkụ eze. Ndị niile nke ala ahụ nọkwa na-aṅụrị ọṅụ na-afụ opi. Atalaya dọwara uwe ya, sị, “Nnupu isi megide eze! Nke a bụ nnupu isi megide ọchịchị!” 15Jehoiada, bụ onye nchụaja nyere ndịisi ọchịagha na-achị narị ndị agha, bụ ndị na-elekọta usuu ndị agha, iwu sị ha, “Sitenụ nʼebe ahụ kpọpụta ya nʼetiti ahịrị unu, onye ọbụla nke gbasoro ya, werenụ mma agha gbuo onye ahụ.” Nʼihi na onye nchụaja sịrị, “Agaghị egbu ya nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.” 16Ya mere, ha jidere ya, mgbe o rutere nʼụzọ ebe ịnyịnya si abata nʼogige ụlọeze, ebe ahụ ka ha nọ gbuo ya. 17Jehoiada mere ka ọgbụgba ndụ dị nʼetiti Onyenwe anyị na eze, na ndị mmadụ, na ha ga-abụ ndị nke Onyenwe anyị. O mekwara ka ọgbụgba ndụ dịrị nʼetiti eze na ndị ahụ. 18Ndị niile nke ala ahụ gara nʼụlọ nchụaja Baal kwatuo ya. Ha tidasịrị ebe nchụaja na arụsị niile dị nʼebe ahụ mee ka ọ darisịa, gbukwaa Matan onye nchụaja Baal nʼihu ebe ịchụ aja ahụ.
Mgbe ahụ, Jehoiada onye nchụaja, debekwara ndị nche ka ha lekọta ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.