Native Bible

2 Kings 10:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ha tụrụ egwu nʼebe ọ dị ukwuu, sị, “Lee, eze abụọ* enweghị ike iguzogide ya, anyị onwe anyị ga-esi aṅaa guzogide ya?”

2 Kings 10:4 in English

2 Kings 10:4 · Berean Standard Bible

But they were terrified and reasoned, “If two kings could not stand against him, how can we?”

Context

2“Ugbu a, mgbe akwụkwọ a rutere unu aka, ebe unu na ụmụ ndị ikom nna unu ukwu nọ, ebe unu nwekwara ụgbọ agha na ịnyịnya, na obodo e wusiri ike na ngwa agha, 3họpụtanụ onye kachasị inwe ugwu ma kwesikwa nʼime ụmụ ndị ikom nna unu ukwu, mee ka ọ nọkwasị nʼocheeze nna ya. Mgbe ahụ, buo agha chebe ụlọ nna unu ukwu.” 4Ma ha tụrụ egwu nʼebe ọ dị ukwuu, sị, “Lee, eze abụọ* enweghị ike iguzogide ya, anyị onwe anyị ga-esi aṅaa guzogide ya?” 5Ya mere, onye ọ dị nʼaka ilekọta ezinaụlọ eze, onyeisi obodo, ndị okenye na ndị niile na-elekọta ụmụ Ehab, dere akwụkwọ a zigara Jehu, sị ya, “Jehu, anyị niile bụ ndị ohu gị. Anyị jikeere ime ihe niile i gwara anyị. Anyị agaghị ahọpụta onye ọbụla dịka eze; gị onwe gị mee ihe ọbụla ị chere na ọ bụ ya kachasị mma.” 6Mgbe ahụ, Jehu degaara ha akwụkwọ nke ugboro abụọ sị ha, “Ọ bụrụ na unu dịnyeere m, ọ bụrụkwa na unu ga-erube isi nye m, chịrịnụ isi ụmụ ndị ikom nna unu ukwu, bịakwute m nʼotu oge a echi na Jezril.” Nʼoge ahụ, ụmụ eze iri ndị ikom asaa nọ nʼaka ndịisi obodo ahụ, ndị na-azụlite ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.