2 Ndị Eze 10:3
2 Kings 10:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
họpụtanụ onye kachasị inwe ugwu ma kwesikwa nʼime ụmụ ndị ikom nna unu ukwu, mee ka ọ nọkwasị nʼocheeze nna ya. Mgbe ahụ, buo agha chebe ụlọ nna unu ukwu.”
2 Kings 10:3 in English
2 Kings 10:3 · Berean Standard Bible
select the best and most worthy son of your master, set him on his father’s throne, and fight for your master’s house.”
Context
1Ugbu a, e nwere ụmụ Ehab ndị ikom ọnụọgụgụ ha dị iri asaa ndị nọ na Sameria,* Jehu dere akwụkwọ ozi ziga Sameria, zigara ndịisi obodo Jezril, zigakwara ndị okenye na ndị na-elekọta ụmụ Ehab ndị ahụ. Ọ sịrị, 2“Ugbu a, mgbe akwụkwọ a rutere unu aka, ebe unu na ụmụ ndị ikom nna unu ukwu nọ, ebe unu nwekwara ụgbọ agha na ịnyịnya, na obodo e wusiri ike na ngwa agha, 3họpụtanụ onye kachasị inwe ugwu ma kwesikwa nʼime ụmụ ndị ikom nna unu ukwu, mee ka ọ nọkwasị nʼocheeze nna ya. Mgbe ahụ, buo agha chebe ụlọ nna unu ukwu.” 4Ma ha tụrụ egwu nʼebe ọ dị ukwuu, sị, “Lee, eze abụọ* enweghị ike iguzogide ya, anyị onwe anyị ga-esi aṅaa guzogide ya?” 5Ya mere, onye ọ dị nʼaka ilekọta ezinaụlọ eze, onyeisi obodo, ndị okenye na ndị niile na-elekọta ụmụ Ehab, dere akwụkwọ a zigara Jehu, sị ya, “Jehu, anyị niile bụ ndị ohu gị. Anyị jikeere ime ihe niile i gwara anyị. Anyị agaghị ahọpụta onye ọbụla dịka eze; gị onwe gị mee ihe ọbụla ị chere na ọ bụ ya kachasị mma.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.