Native Bible

2 Kings 1:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Eze jụrụ ha sị, “Onye bụ nwoke a zutere unu nʼụzọ gwa unu okwu ndị a? Olee ụdị mmadụ ọ bụ?”

2 Kings 1:7 in English

2 Kings 1:7 · Berean Standard Bible

The king asked them, “What sort of man came up to meet you and spoke these words to you?”

Context

5Ndị ozi ahụ laghachiri azụ. Ma mgbe eze hụrụ ha, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji lọghachi?” 6Ha zara ya, “Otu nwoke zutere anyị nʼụzọ sị anyị, ‘Laghachi ga zie eze ahụ zitere unu sị ya: “Ihe ndị a, ka Onyenwe anyị kwuru, Ọ bụ nʼihi na Chineke anọghị nʼIzrel ka i ji zipụ ndị mmadụ ka ha gaa jụta ase site nʼaka Baal-Zebub, chi ndị Ekrọn? Nʼihi nke a, ị gaghị esite nʼihe ndina gị bilie. Ya doo gị anya na ị ghaghị ịnwụ!” ’ ” 7Eze jụrụ ha sị, “Onye bụ nwoke a zutere unu nʼụzọ gwa unu okwu ndị a? Olee ụdị mmadụ ọ bụ?” 8Ha zaghachiri ya, “Ọ bụ nwoke yi uwe e ji ajị anụ kpaa; o kere ihe okike akpụkpọ anụ nʼukwu ya.” Eze sịrị, “Ọ bụ Ịlaịja, onye amụma si Tishbe!” 9Mgbe ahụ, eze zigara otu onyeisi agha ya, na iri ndị agha ise ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ndị agha ahụ bịarutere hụ Ịlaịja ka ọ nọ ala nʼelu ugwu, onyeisi agha ahụ kpọrọ Ịlaịja sị ya, “Onye nke Chineke, eze sị gị, ‘rituo!’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.