2 Ndị Eze 1:17
2 Kings 1:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ nwụrụ dịka okwu Onyenwe anyị nke Ịlaịja kwuru si dị. Nʼihi na Ahazaya enweghị nwa nwoke ọbụla, Jehoram* nọchiri anya ya dịka eze, nʼafọ nke abụọ nke ịbụ eze Jehoram nwa Jehoshafat, bụ eze Juda.
2 Kings 1:17 in English
2 Kings 1:17 · Berean Standard Bible
So Ahaziah died according to the word of the LORD that Elijah had spoken. And since he had no son, Jehoram * succeeded him in the second year of the reign of Jehoram son of Jehoshaphat over Judah.
Context
15Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Ịlaịja okwu sị ya, “Atụla egwu! Soro ya gaa!” Ya mere, Ịlaịja sooro onyeisi agha ahụ gaa nʼihu eze. 16Mgbe Ịlaịja ruru nʼihu eze, ọ gwara eze okwu sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ọ bụ nʼihi na Chineke anọghị nʼIzrel ka i ji zipụ ndị ozi ka ha gaa jụta ase site nʼaka Baal-Zebub, chi ndị Ekrọn? Ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, ị gaghị esite nʼihe ndina gị bilie. Ị ga-anwụrịrị!” 17Ọ nwụrụ dịka okwu Onyenwe anyị nke Ịlaịja kwuru si dị.
Nʼihi na Ahazaya enweghị nwa nwoke ọbụla, Jehoram* nọchiri anya ya dịka eze, nʼafọ nke abụọ nke ịbụ eze Jehoram nwa Jehoshafat, bụ eze Juda. 18Akụkọ banyere ịbụ eze nke Ahazaya, na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel?
1:2 Baal-Zebub bụ aha ndị Kenan, nke pụtara eze mmụọ ọjọọ, maọbụ ekwensu. Beel-Zebub nke pụtara, eze ụmụ ijiji bụ aha ịkwa emo nye chi ndị Kenan a na-akpọ Baal-Zebub. Mat 10:25; 12:27
1:17 Maọbụ, Joram dịka a na-akpọ ya mgbe ụfọdụ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.