2 Ndị Eze 1:15
2 Kings 1:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Ịlaịja okwu sị ya, “Atụla egwu! Soro ya gaa!” Ya mere, Ịlaịja sooro onyeisi agha ahụ gaa nʼihu eze.
2 Kings 1:15 in English
2 Kings 1:15 · Berean Standard Bible
Then the angel of the LORD said to Elijah, “Go down with him. Do not be afraid of him.” So Elijah got up and went down with him to the king.
Context
13Ọzọkwa, eze zigara otu onyeisi agha na iri ndị agha ise ọzọ ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ndị agha a bịara hụ Ịlaịja, onyeisi agha ahụ rigoro nʼelu ugwu gbuo ikpere nʼala nʼihu Ịlaịja rịọọ ya amara sị ya, “Onye nke Chineke, biko, meere ohu gị na iri ndị agha ise mụ na ha so ebere. 14Lee, ọkụ esitela nʼeluigwe rechapụ ndịisi agha abụọ ahụ buru ụzọ, ha na ndị agha ha. Ugbu a, biko, arịọ m gị, chebe ndụ anyị.” 15Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Ịlaịja okwu sị ya, “Atụla egwu! Soro ya gaa!” Ya mere, Ịlaịja sooro onyeisi agha ahụ gaa nʼihu eze. 16Mgbe Ịlaịja ruru nʼihu eze, ọ gwara eze okwu sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ọ bụ nʼihi na Chineke anọghị nʼIzrel ka i ji zipụ ndị ozi ka ha gaa jụta ase site nʼaka Baal-Zebub, chi ndị Ekrọn? Ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, ị gaghị esite nʼihe ndina gị bilie. Ị ga-anwụrịrị!” 17Ọ nwụrụ dịka okwu Onyenwe anyị nke Ịlaịja kwuru si dị.
Nʼihi na Ahazaya enweghị nwa nwoke ọbụla, Jehoram* nọchiri anya ya dịka eze, nʼafọ nke abụọ nke ịbụ eze Jehoram nwa Jehoshafat, bụ eze Juda.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.